Post on 23-Mar-2023
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
Onye Nkuzi: ODOZIAKU ONYEMUCHE
ASUSU IGBO
SS1
IHE OMUME, TAAM NKE ATO (3rd TERM SCHEEME OF WORK)
2. Olu ndi na Igbo izugbe
b. Agumagu “Achoba isi ochu”
ch. Oruaka di iche iche eji mara ndi Igbo
3. Uru Igbo izugbe na olu mba bara
b. Agumagu
ch. Uru oruaka bara
4. Ahuike ndi ntorobia; oria mminwu
b. Agumagu
ch. Mkpa o di ikwalite oruaka
5. Akara edemede na atumatu okwu igbo
6. Ezinulo nke onye
b. Oru diiri onye obula n’ezinulo
7. Edemede na udi ya di iche iche
b. Agumagu
ch. Agumagu (dirigawa)
8. Agumagu akwukwo akuko
9. Agumagu (dirigawa)
10. Agumagu (dirigawazie)
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
IZUUKA NKE ABUO
OLUNDI NA IGBO IZUGBE
Olu ndi bu etu ndi obodo di iche iche nwere otu asusu si edebe olu asu asusu ahu.
Omumatu olundi ufodu a na-akpo aha di iche iche n’obodo di iche iche:
Aha Bekee Aha igbo di iche iche
1. One Otu,ofu,nge,nnaa,oli
2. Groundnut Opapa, ahuekere, okpukpa,
asuboko
3. Body Ahu, alu,ashu
4. Year Afo, aro, alo, awho
5. House Ulo, uno, unyo, uyo
Igbo izugbe bu asusu Igbo e kwekoritara ka o buru asus jikotara Igbo nile onu
n’agbanyeghi ebe onye siri puta.
Igbo izugbe bu olu igbo e sitere n’olu di iche iche enwere n’asusu igbo wee mebe nke a
turu anya na nwafo igbo obula ga aghota, gutawnwuo ma detakwa ya na agbanyeghi
akuku ala igbo o sitere na ya.
Omumatu olundi na igbo izugbe
Olundi Igbo izugbe
a) mmili Mmiri
b) Olili Oriri
c) O buru O buru
d) Lie Rie
e) Eru Elu
f) Ani Ala
g) Nee Lee
h) Ogonogo Ogologo
i) Ekene Ekele
j) Inu nwanyi Ilu nwanyi
k) Ejena Ejela
l) Afifia Ahihia
m) Afa Aha
n) Fa Ha
o) Ife Ihe
p) Efi Ehi
q) Ifunanya Ihunanya
r) Afufu Ahuhu
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
s) Aru Ahu
t) Iru Ihu
u) Rapu Hapu
v) Aruru Ahuhu
w) Oru Ohu
x) aro Afo
Ndiche olundi na igbo izugbe
Olu mba Igbo izugbe
I. O bu nani otu mpaghara ala igbo na-asu ya Ana ask ya na-ede dum
n’ala igbo
II. Ejighi ya akuzi ihe n’uloakwukwo Eji ya akuzi ihe n’ulo
akwukwo
III. Ejighi ya ede akwukwo maobu edemede
obula
O bu ya ka eji ede
edemede ndi ozo
IV. Naani ndi nwe ya na-aghota ya n’ozuzu oke.
Ide ya adighi mfe.
O bu olu onye Igbo obula
na-aghota. Ide ya di mfe
V. Onwegasiri ndi nwe ha. O bughi onye obula
ga-enwe ike isu na igu ya maobu dee ya
Onweghi ndi nwe ya
Ndiiche di n’olu ndi na ibe ya
Onicha Owere
• Afia Ahia
• Efi Ehi
• Efifie Ehihie
• Afufu Ahuhu
• Ulo Uyo
• A maro m A maghi m
• O bu gini Owu nini ?
• Kedu otu i mere Bia ngaa
• Bia ebe a
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
Njirimara Igbo Izugbe
1. O bu olu ala Igbo dum na-asu ma na aghotakwa
2. O bu olu e sitere n ‘olumba mebe
3. O bu ya ka e ji akuzi ihe n’ulo akwukwo
4. E nwere usoro a na-agbaso n’igu nakwa ide ya
5. O na-agbanwokwa agbanwo site n’iwepu okwu ochie tinye nke ohuru
6. O bu ya ka e ji mara ndi Igbo
7. O bu ya jikotara Igbo nile onu
Njirimara Olundi
1. O bu olu mba di iche iche n’ala igbo nwere
2. O bu na ya ka e si mebe igbo izugbe
3. O zughi igbo nile onu
4. Ejighi ya akuzi ihe n’ulo akwukwo
5. O bughi olu mba nile ka enwere igbo izugbe ya
6. Olumba enweghi oghere ito eto nke o ji agbanwo agbanwe
7. Olundi baara mba nwe ya uru n’ihi na o na-akowaputacha omenala ha
8. O nweghi olundi ka ibe ya mma
Uru olundi baara igbo izugbe
1. O bu site na olundi di iche iche ka e ji mebe igbo izugbe
2. E wepu olundi, igbo izugbe agaghi adi
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
IZUUKA NKE ATO
ORUAKA
Akaoru bu ihe mmadu na-eme na ndu maobu ejiri mara ya nke a na-esite na ya enwete
nri ubochi ha. Ndi igbo kwenyere n’ aka aja aja na-ebute onu mmanu mmanu., ozokwa
na ngana kpuchie ute, aguu ekpughee ya. O bu ya ka ha ji agba mbo inwe ihe onye na-
eme e ji mara ya.
Ndi igbo dika ndi eji igba mbo mara nwere udidi oruaka di iche iche ha na-aru nke
gunyere:
1. Izu ahia/itu mgbere
2. Ikpu uzu
3. Ikpu ite
4. Ikwa akwa
5. Ikwo ugboala
6. Imezi ugboala
7. Ikwa nka/kapinta
8. Ikpu isi/ike isi/idozi isi
9. Iji ime/ibe ugwu
10. Ime dibia
11. Iru ulo
12. Ikwe ekwe
13. Ikpa nkata
14. Iku azu
15. Ikpa ihe okpukpa
16. Iru oru ugbo
17. Izu umu anumanu bi n’ulo
Oru ugbo
Eji oru ugbo mara ndi igbo. Ha na akoputa ji, akpu, ede, oka, osikapa, egwusi, akwukwo
nri, dgz.
Iku azu
Akaoru ozo eji mara ndi igbo bu iku azu. Ndi ma-aku azu n’ala igbo bu ndi bi n’akuku
mmiri. Ha na-eji ukpo, ogbu na ugbo wee na-aku azu.
Ikpa umu anumanu
Izu ewu, okuko, ezi, nkita na umu anumanu ndi ozo bukwa akaoru ozo ejiri mara ndi
igbo. Ha na-akpa umu anu ndia dika nri, onye nche, nnonyere na iji nweta ego.
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
Ite mmanya
Ite mmanya sokwa n’oruaka ndi igbo. Osisi a na-ete were enwete mmanya bu ngwo na
nkwu. Ya mere e ji akpo mmanya enwetere na ha “mmanya ngwo” na “mmanya nkwu”.
Ebe esi enwete mmanya nkwu elu n’ala igbo bu Enugwu Ezike, ebe esi enwete manya
ngwo ke oma bu Oba na Ugwu Oba. Mmanya ndi a na-ene ndi na-ete ha ego n’uju.
Ichu nta
Ichu nta bukwa akaoru eji mara ndi igbo. Ndi ji ya mere akaoru na-ano n’ime ohia mgbe
obula na-ede anu ha ga-egbu. Ihe e ji achu nta bu mma, uta, egbe, nkita, dgz.
Azumahia
Akaoru ejiri mara ndi igbo bu izu ahia. O bu azumahia ka e jiri mara obodo dika Onicha,
dgz.
Ime dibia/igba afa
Ime dibia sokwa n’akaoru eji mara ndi igbo. Ndi dibia na-agba afa, na-achu aja ma na-
enyekwa ndi oria ogwu.
Oruaka Obodo na-aru ya
1. Oru ugbo Anam, Ogbaru, Abakaleke, Afoikpo,
Ohaozara, Aguleri,
2. Iku azu Asaba, Ogbaru, Anam, Aguleri
3. Ikpa umu anumanu Abakaleke na Ohaozara
4. Azumahia Onicha, Nnewi, Oka, Abia, Owerri na
Arochukwu
5. Ite nkwu Eziagu, Udi, Oba, Ugwuoba, Enugwu
Ezike
6. Ichu nta Achalla
7. Igbu ichi Umunachi
8. Ikpu uzu Oka, Izza
Uru Oruaka Bara
1. Oruaka na-enye ego
2. O na-ebeleta ime mpu n’obodo
3. O na-akwalite omenali ndi
4. O na-eme ka mmadu nwee ugwu
5. O na-akwalite mmekorita mmadu na ibe ya
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
IZUUKA NKE ANO
OGUGU NA AGHOTAAZAA
NDI NTOROBIA
Ndi ntorobia bu umunwoke na umunwanyi di n’agbata afo iri abuo wee gaa n’agbata
afo iri abuo na otu.
Ha bu ndi no n’agbata umuaka na ndi okenye. Ha abughi umuaka nke ha ji abu okenye.
Ha bu ndi malitere ibi ndu ohuru na ejighi ihe kporo ihe.
Otutu n’ime ha ka ndu ha na-ejuputa n’akparamagwa ojoo di iche iche nke ha na-amuta
n’aka onwe ha. Otutu n’ime ha anaghi enwe echiche maka echi, naani ihe ha maara bu
‘ihe chi fotere ya foro, ogbasaghi ha’.
Mgbanwe A Na-Ahu N’etiti Ndi Ntorobia
Ufodu mgbanwe ha na-enwe n’ahu ha na-eme ha a noro n’ihere.
Mgbanwe n’ ahu umunwoke
a) Ha na-agba afo onu
b) Ha na-agba aji na abu
c) Ha na-agba aji n’ obi ha
d) Aji na-ejuputa n’gburugburu ahu ha niile tinyere n’ ihe ha jiri buru nwoke
e) Olu ha na-ada oke uda mgbe ha na-ekwu okwu
f) Okpukpa ha na-esikwa Nnukwu ike. Ufodu na-achiputa ukwu ogologo ma
gbakwaa dimkpa.
Mgbanwe n ‘ ahu umunwanyi
i) Ha na-etopu ihe eji mmadu eme
ii) Ha na-akpu ara
iii) Oge a bu oge ha ji ebido ahu nso ha
iv) Ha na-agbakwa aji n’ abu ya n’ ihe ha jiri buru nwanyi
v) N’ oge di out a, ahu ha na-aputa nke oma iji gosi na ha etoruola ihe eji mmadu
eme.
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
Agwa ojoo e nwere ike ihu mgbe ndi mmadu na-etolite gunyere.
1. Nnupu isi
2. Inu ogu
3. Emweghi ndidi
4. Igba akwuna
5. Ise igbo
6. Mpu ule, dgz
AHUIKE NDI NTOROBIA
Ahuike bu mgbe mmadu na-enweghi nria nria maobu ntupo na ihe mgbakasi ahu na ahu
ya nakwa na ndu ya. Ahuike ndi ntorobia bu gbe umuaka na-eto eto nwere mgbasi ike
na ahu ma zuo oke na mmadu. O di otutu uru ndi ntorobia na-erite ma ha nwee ahuike.
Onye nwere ahuike na-enwe anuri, o na-agbo mbo onwe ya site n’ije akwukwo maobu
oru ndi ozo. Otutu oria nwere ike imetuta ndi ntorobia gunyere ndia:
(a) Oria mminwu
(b) Gonoria
(c) Ochananya
(d) Iba ojii
(e) Ukwaranta
(f) Iba
(g) Oria akpukpa
(h) Ihe mgbu nwanyi no n’ nso
(i) Anya mgbu
ORIA MMINWU
Oria mminwu maobu oria obirinajaocha bu ajo oria nke a na-ebutekari site na mmetuta
obara. O bu site na mmeko n’uzo di iche iche. nje a kporo HIV na bekee na-abanye
n’ahu onye enweghi oria a site n’ahu onye nwere ya ma obara ha nwee mmekorita. O
na-abanye n’obara ya na miri ahu mmadu ma gbuo ihe na echekwa ahu. Onye ahu ewee
daa n’oria mminwu maobu obilinajocha. A choputara oria na afo 1981 na mba America
ebe onye mbu nwetere ya sitere Uganda n’afo 1982.
Uzo di iche iche esi ebute oria mminwu
A. Mekorita nwoke na nwanyi
B. Itinye obara onye na-aria oria a n’ ahu onye ebughi ya n’uloogwu
C. Iji ihe nwanyi onye bu oria mminwu ji muo nwa were muo onye ozo na-ebughi
ya
D. Iji otu ihe ikpu isi kpuo otutu mmadu isi
E. Iji otutu ntutu gbaa ogwu.
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
IZUUKA NKE ISE
USORO ODIDE AKARA EDEMEDE
Akara deemed bu umu irighiri akara a na-etinye mgbe a na-ede edemede maobu a na-
etinye n’ihe edemede iji mee ka ihe ahu nwee nghota zuru oke ma dikwa uto ogugu.
Nkenuudi akara edemede
1. akara kpom ( . ) fullstop
2. kpom kpom ( : ) colon
3. kpom rikom( ; ) semicolon
4. rikom ( , ) comma
5. rikom elu ( ‘ ) apostrophe
6. akara ngwu ( “ “ ) quotation mark
7. akara mkpu ( ! ) exclamatrion mark
8. akara ajuju ( ? ) question mark
9. akara mkpuchi ( ( ) ) bracket
10. akara uhie ( - ) hyphen
11. akara udaolu ( / \ - ) tone mark
12. akara nkwubiri ( … ) elipses
13. akara mmagha
1. Akara kpom ( . ) fullstop
kpom bu akara a na-etinye n’edemede nke na-egosi nkwusi n’ahiriokwu.ima atu,
a. puo .
b. o na-eri nri .
c. aha m bu Ekele .
2. Rikom ( , ) comma
o bu akara edemede na-egosi na okwu akwusibeghi. O na-adi ebe enwere ntakiri
nkukume n’ahiriokwu. Ima atu,
a. nne m gara ahia zuta ose, nnu, ede, osikapa, na unere
3. Rikom elu ( ‘ ) apostrophe
nke a bu akara edemede a na-etinye n’ahiriokwu were mbuzo maobu ebe udaume
na-esote udaume ibe ya. Ima atu,
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
a. Mmiri di n’ime ite
b. akwukwo di n’ elu oche.
4. Akara ajuju ( ? ) question mark
nke a bu akara a na-etinye n’ ajuju obula. Ima atu,
a. alee ebe igala ?
b. afo Ole ka I di ?
c. kedu aha gi ?
ATUMATUOKWU
Atumatuokwu bu okwu nka di iche icge eji acho okwu na ederede mma.
Atumatuokwu di iche iche
1. mburu (metaphor)
2. myiri (simile)
3. nsinauda
4. mmemmadu
5. nkwusara
6. egbeokwu
7. ajuju nzaraonwe
8. ekwuecheozo
9. ilu
10. akparaokwu
11. asinilu
12. nhagideokwu
13. igbuduokwu
MBURU (metaphor)
Nke a bu atumatuokwu na-egosi n’ihe a na-ekwu maka ya buzi ihe ozo iji gosi ka
akparamagwa n’odide ha siri buru otu. Omumaatu;
a. nna m bu agu
b. oroma a bu shuga
c. Nneka bu anyanwu ututu
d. Adaugo bu ewu
e. Chibuzo bu edi
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
MYIRI (simile)
Nke a bu atumatuokwu eji egosiputa n’ihe di ka ihe ozo maobu n’ihe akporo aha na-
eme ka ihe ozo.
Omumatu
a. O piri onu ka ntu
b. Nweke na-alu oru ka agu
c. O ruru ogu ka agu
d. Nwoke a na-eji ka unyi
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
IZUUKA NKE ISII
EKWUMEKWU NKOWA BANYERE EZINAULO ONWE
Gini bu ezinaulo onwe ?
Ezinaulo onwe bu mmadu na ndi mutara ya bi n’otu ebe
Ezinaulo bu ewumewu nwere Nnukwu onodu na ndu ndi igbo. O bu ebe di, nwunye na
umuaka bi n’otu ngwuru. O bu na ezinaulo ka mmekorita mmadu n’ibe ya n’amalite.
Nwata obula bi n’ezinaulo kwesiri ka o mara aha onwe ya, aha nna ya, aha nne ya, aha
umunne ya, aha Nnukwu nna nna nakwa nke nne, aha nnukwu nne nna nakwa oruaka
nne na nna.
Oru diiri onye n’ ezinaulo
ORU NNA
1. Iru ulo ebe obibi
2. Iweta ego nri
3. Ikwu ugwo akwukwo
4. Iweta ego ulo ogwu
5. Inye umuaka ezigbo ndumodu
6. Ikuziri umuaka omenala
7. Idozi esemokwu obula putara n’ezinaulo
ORU NNE
A na-ahuta nne dika onye enyemaka n’ezinaulo. Oru nne n’ezinaulo gunyere :
1. Ilekota di ya, umuaka, ndi odibo na ndi ezinaulo ya anya nke oma
2. Isi nri ha ga-eri
3. Idebe ezinaulo ocha
4. Ikuziri umuaka etu e si aga ozi
5. Inye umuaka ndumodu
6. Ihu na umuaka na-adi ocha
7. I toro umuaka ezi ukpuru ha ga enomi
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
ORU UMUAKA
Umuaka nwere oru diiri ha n’ezinaulo dika ndia;
1. Ikwanyere ndi toro ha na ndi okenye ugwu na I na-asopuru ha
2. Ichu miri
3. Isu akwa
4. Ihicha ulo
5. Iza ulo
6. Isucha ahihia di na gburugburu ulo ha
7. Isi nri
8. Idobe iwu na omenala obodo ha
9. Ilekota nne na nna ha anya gbe ha kara nka.
Nrubere Onye N‘ Ezinaulo
Nrubere nna na nna
O bu ihe kwesiri ka umuaka na-emere nne na nna ihe ndia
a) Umuaka kwesiri irubere nne na nna ha isi
b) Isopuru ha
c) Ijere ha ozi
d) Ile ha nka
Nrubere umuaka n‘ ezinaulo
a) Nne na nna ga na-elekota umuaka ha anya nke oma
b) Ha agaghi emegbu ha tumadi ndi abughi umu ha kpomkwem
c) Nne na nna ga na-egosi ha ihunanya
d) Iwu ji ha i nyeju ha afo
e) Izurite ha n’ akwukwo
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
IZUUKA NKE ASAA
EDEMEDE
Gini bu edemede ?
Edemede bu ihe obula mmadu ji echiche ya were cheputa ma dee ya ede n’akwukwo
nke nwere nghota na echiche zuru oke.
Edemede di nnukwu mkpa n’ule niile n ‘Igbo. Nwata akwukwo obula amaghi etu esi
ede edemede nke oma ekwesighi inwe nchekwube o na-agafe n’ ule Igbo makana
edemede na-ebu nnukwu maaki.
Ihe edemede obula kwesiri inwe
i) Isiokwu
ii) Nkeji na nkeji
iii) Ezi nchoputa
iv) Aka nka
v) Akara edeede
vi) Ezi nghota
vii) Nka asusu
Udi edemede di iche iche
a. Edemede nkowa (descriptive essay)
b. Edemede akomako (narrative essay)
c. Edemede mkparitauka (dialogue)
d. Edemede nkowami (expository essay)
e. Edemede ilu (proverbial essay)
f. Edemede arumaruka (argumentative essay)
g. Edemede ekwumekwu (address/speech)
h. Edemede leta (letter writing)
Edeede nwekwara usoro esi ede ya dika usoro ato ndia
1. Mmalite (introduction)
2. Etiti (body of the essay)
3. Mmechi (closure)
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
IZUUKA NKE ASATO
EZUMIIKE OKARA TAAM
IZUUKA NKE ITEGHETE
NKOWA EDEMEDE NKE OBULA
A. Edemede ekwumekwu
Nke a bu edemede e ji edeputa okwu mmadu ga-agwa ogbako maobu ihe madu ga-ekwu
n’ebe e nwere ogbako. N’ ederede a, a na-enwe ekele mmalite na nke mmechi, aha ode
na ihe o bu. Ufodu isiokwu udi edemede a bu ndia;
1. Dika onyeisi uloakwukwo, deputa ihe I ga-agwa ohaneze ubochi ogbako jikotara
ndi nne na ndi nkuzi uloakwukwo gi
2. I bu sinio prefekti n’ulo akwukwo unu, deputa ihe I ga-agwa ndi madu ubochi
mmemme ulo akwukwo unu, i ji asi ndi guchara akwukwo n’ulo akwukwo aha
gaa nke oma
B. Edemede nruritauka
Nke a bu edemede na-egosi mgbagha di n‘etiti otu abuo. Na mbido nruritauka, a na-
ebu uzo kelee onye isi oche, ndi so na nruritauka ahu na oha na eze na-ege nti.
Omumaatu isiokwu edemede nruritauka gunyere
1. Ndi Nkuzi ka mkpa karia ndi dibia oyibo
2. Nne ka mkpa n’ezinaulo karia nna. Olee ebe ikwu?
3. Izu ahia ka mma karia oru ugbo. Dee ihe bu uche gi maobu ebe ikwu.
C. Edemede ilu
Edemede ilu na-abukari ikowa ilu a turu iji gosi ezi nghota di n’ilu ahu. E nwere ike i ji
otu akuko wee kowaa ilu mana o ka mma i ji akuko abuo maobu ato weee kowaa ilu ka
nghota di n’ilu ahu wee putachaa ihe nke oma. Nke a bu ilu enwere ike inye n’ule ka e
dee.
1. Anu nwere ndidi na-anu mmiri oma
2. Ire oma ka ejule ji aga n’ogwu
3. Awo anaghi agba oso ehihie n’efu
4. Ihe na-ato uto na-egbu egbu
BUBENDORFF MEMORIAL GRAMMAR SCHOOL, ADAZI-NNUKWU
BMGS …. Greatness Through Hardwork
D. Edemede leta
Enwere udi leta abuo, ha bu;
1. Leta nkeonye
2. Leta anamaachoihe/anamaachooru
Usoro a na-agbaso n’ide leta abuo a di iche iche. Otu e si amalite ha na otu e si emechi
ha abughi otu ihe. N’aka nke ozo, otu esi edewe onu na ekwuputa ihe ebu n’uche n’udi
leta abuo a abughi otu.
Leta Nkeonye
Nke a bu leta mmadu nwere ike i degara nna ya, nne ya, umunnne ya , na ndi ikwunaibe
ya. Ihe ndi di mkpa na leta Nkeonye gunyere ;
a. Adreesi odee
b. Ekele mmalite
c. Ahu leta
d. Mmechi
e. Adreesi n’obo leta
Leta Anamachoihe
O bu leta e ji acho ihe dika oru bekee maobu oru ngo. O nwere ihe ole na ole mere leta
anamachoihe ji di iche na leta nkeonye. Onye a-ede leta nkeonye ga-ama onye o na-
edegara ya ma o dighi mkpa na onye na-ede leta anamachoihe ga-amariri onye o na-
edegara ya. Leta anamachoihe na-enwe adreesi abuo; nke onye na ede ya na nke onye a
na-edegara leta ahu. Ha abuo na-adi n’akaekpe malite n’ahiri na-esote ahiri adreesi onye
na-ede leta kwusiri.